Native Bible

Joel 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”

Joel 2:12 in English

Joel 2:12 · Berean Standard Bible

“Yet even now,” declares the LORD, “return to Me with all your heart, with fasting, weeping, and mourning.”

Context

10Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè. 11Olu Onyenwe anyị dara nʼihu ndị agha, ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ, ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya. Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu bụrụkwa ihe dị egwu. Onye pụrụ ịnagide ya? 12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.