Juel 2:12
Joel 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”
Joel 2:12 in English
Joel 2:12 · Berean Standard Bible
“Yet even now,” declares the LORD, “return to Me with all your heart, with fasting, weeping, and mourning.”
Context
10Ala na-ama jijiji nʼihu ha,
eluigwe na-emekwa mkpọtụ.
Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị,
kpakpando adịghịkwa enye ìhè. 11Olu Onyenwe anyị dara
nʼihu ndị agha,
ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ,
ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya.
Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu
bụrụkwa ihe dị egwu.
Onye pụrụ ịnagide ya? 12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.
Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu,
ọ bụghị uwe unu.
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere.
Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya.
Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya,
hapụrụ anyị ngọzị ya,
kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ
maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.