Juel 2:13
Joel 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
Joel 2:13 in English
Joel 2:13 · Berean Standard Bible
So rend your hearts and not your garments, and return to the LORD your God. For He is gracious and compassionate, slow to anger, abounding in loving devotion.* And He relents from sending disaster.
Context
11Olu Onyenwe anyị dara
nʼihu ndị agha,
ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ,
ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya.
Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu
bụrụkwa ihe dị egwu.
Onye pụrụ ịnagide ya? 12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.
Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu,
ọ bụghị uwe unu.
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere.
Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya.
Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya,
hapụrụ anyị ngọzị ya,
kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ
maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu. 15Fụọ opi ike nʼime Zayọn.
Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọkọta nzukọ dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.