Juel 2:17
Joel 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”
Joel 2:17 in English
Joel 2:17 · Berean Standard Bible
Let the priests who minister before the LORD weep between the portico and the altar, saying, “Spare Your people, O LORD, and do not make Your heritage a reproach, an object of scorn among the nations. Why should they say among the peoples, ‘Where is their God?’”
Context
15Fụọ opi ike nʼime Zayọn.
Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16Chịkọtaa onye ọbụla,
doo nzukọ ahụ nsọ,
ma ndị okenye,
ma ụmụntakịrị,
ma ụmụ na-aṅụ ara.
Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya,
ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya. 17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi,
nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa.
Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị.
Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta,
nʼetiti mba dị iche iche.
Ekwela ka ha sị,
‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ” 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya,
nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ. 19Onyenwe anyị zaghachiri ha sị,
“Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,
nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ.
Agaghị m emekwa
ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.