Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.

Job 42:5 in English

Job 42:5 · Berean Standard Bible

My ears had heard of You, but now my eyes have seen You.

Context

3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. 4“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ 5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị. 6Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.” 7Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.