Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.

Job 42:3 in English

Job 42:3 · Berean Standard Bible

You asked, ‘Who is this who conceals My counsel without knowledge?’* Surely I spoke of things I did not understand, things too wonderful for me to know.

Context

1Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị: 2“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. 3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. 4“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ 5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.