Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’

Job 42:4 in English

Job 42:4 · Berean Standard Bible

You said, ‘Listen now, and I will speak. I will question you, and you shall inform Me.’*

Context

2“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. 3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. 4“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ 5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị. 6Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.