Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.

Job 41:22 in English

Job 41:22 · Berean Standard Bible

Strength resides in his neck, and dismay leaps before him.

Context

20Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.* 21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ. 22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu. 23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha. 24Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.