Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.

Job 41:23 in English

Job 41:23 · Berean Standard Bible

The folds of his flesh are tightly joined; they are firm and immovable.

Context

21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ. 22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu. 23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha. 24Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe. 25Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.