Job 41:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.*
Job 41:20 in English
Job 41:20 · Berean Standard Bible
Smoke billows from his nostrils as from a boiling pot over burning reeds.
Context
18Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;
anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ. 19Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,
icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya. 20Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,
dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.* 21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.
Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ. 22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,
obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.