Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?

Job 4:17 in English

Job 4:17 · Berean Standard Bible

‘Can a mortal be more righteous than God, or a man more pure than his Maker?

Context

15Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ. 16Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị: 17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya? 18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe, 19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.