Job 4:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
Job 4:17 in English
Job 4:17 · Berean Standard Bible
‘Can a mortal be more righteous than God, or a man more pure than his Maker?
Context
15Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.
Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ. 16Ọ kwụsịrị;
ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ.
Onyinyo guzooro nʼanya m,
anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị: 17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?
Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya? 18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,
ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe, 19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,
bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,
ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.