Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.

Job 4:19 in English

Job 4:19 · Berean Standard Bible

how much more those who dwell in houses of clay, whose foundations are in the dust, who can be crushed like a moth!

Context

17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya? 18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe, 19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla. 20Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga. 21Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.