Job 4:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
Job 4:18 in English
Job 4:18 · Berean Standard Bible
If God puts no trust in His servants, and He charges His angels with error,
Context
16Ọ kwụsịrị;
ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ.
Onyinyo guzooro nʼanya m,
anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị: 17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?
Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya? 18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,
ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe, 19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,
bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,
ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla. 20Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:
ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.