Job 39:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
Job 39:19 in English
Job 39:19 · Berean Standard Bible
Do you give strength to the horse or adorn his neck with a mane?
Context
17Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe
maọbụ kenye ya oke na inwe uche. 18Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,
ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị. 19“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,
ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya? 20Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,
were ebube* nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu? 21Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,
ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.