Job 39:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
Job 39:15 in English
Job 39:15 · Berean Standard Bible
She forgets that a foot may crush them, or a wild animal may trample them.
Context
13“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,
ma a pụghị iji nku ya tụnyere
nku na abụba nke ụgbala. 14Ọ na-eyi akwa ya nʼala
ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ. 15Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha
maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha. 16Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,
ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu. 17Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe
maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.