Job 39:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
Job 39:14 in English
Job 39:14 · Berean Standard Bible
For she leaves her eggs on the ground and lets them warm in the sand.
Context
12I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka
site nʼebe ịzọcha ọka gị? 13“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,
ma a pụghị iji nku ya tụnyere
nku na abụba nke ụgbala. 14Ọ na-eyi akwa ya nʼala
ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ. 15Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha
maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha. 16Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,
ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.