Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,

Job 38:10 in English

Job 38:10 · Berean Standard Bible

when I fixed its boundaries and set in place its bars and doors,

Context

8“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe* mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta, 9mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike, 10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya, 11mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’? 12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.