Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
Job 3:6 in English
Job 3:6 · Berean Standard Bible
If only darkness had taken that night away! May it not appear among the days of the year; may it never be entered in any of the months.
Context
4Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị:
ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya;
ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya. 5Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya,
ka igwe ojii kpuchigidekwa ya,
ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu. 6Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya,
ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ,
ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa. 7Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu,
ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya. 8Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ,
bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.