Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.

Job 3:5 in English

Job 3:5 · Berean Standard Bible

May darkness and gloom reclaim it, and a cloud settle over it; may the blackness of the day overwhelm it.

Context

3“Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’ 4Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya. 5Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu. 6Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa. 7Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.