Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.*
Job 3:8 in English
Job 3:8 · Berean Standard Bible
May it be cursed by those who curse the day *— those prepared to rouse Leviathan.
Context
6Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya,
ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ,
ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa. 7Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu,
ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya. 8Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ,
bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.* 9Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị,
ka o lee anya ìhè na-efu,
ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ, 10nʼihi na o mechighị akpanwa nne m,
i zonarịkwa anya m nsogbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.