Job 3:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
Job 3:17 in English
Job 3:17 · Berean Standard Bible
There the wicked cease from raging, and there the weary find rest.
Context
15mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo,
ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha. 16Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo,
dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya? 17Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara,
nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike. 18Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha,
ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha. 19Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ;
ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.