Job 3:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
Job 3:19 in English
Job 3:19 · Berean Standard Bible
Both small and great are there, and the slave is freed from his master.
Context
17Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara,
nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike. 18Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha,
ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha. 19Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ;
ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya. 20“Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè?
Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu? 21Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa,
ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.