Job 28:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
Job 28:8 in English
Job 28:8 · Berean Standard Bible
Proud beasts have never trodden it; no lion has ever prowled over it.
Context
6Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;
aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo. 7Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;
anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya. 8Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,
ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ. 9Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ
mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè. 10Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ,
anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.