Job 28:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
Job 28:6 in English
Job 28:6 · Berean Standard Bible
Its rocks are the source of sapphires, containing flecks of gold.
Context
4Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,
nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,
nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.* 5Ala ahụ e si na ya enweta nri,
abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya. 6Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;
aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo. 7Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;
anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya. 8Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,
ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.