Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.

Job 28:9 in English

Job 28:9 · Berean Standard Bible

The miner strikes the flint; he overturns mountains at their base.

Context

7Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya. 8Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ. 9Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè. 10Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile. 11Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.