Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.

Job 26:5 in English

Job 26:5 · Berean Standard Bible

The dead tremble— those beneath the waters and those who dwell in them.

Context

3Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara. 4Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu? 5“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya. 6Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi* tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. 7Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.