Job 14:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.
Job 14:19 in English
Job 14:19 · Berean Standard Bible
as water wears away the stones and torrents wash away the soil, so You destroy a man’s hope.
Context
17A ga-ekechi njehie m nʼakpa,
ị ga-ekpuchi mmehie m. 18“Ma dịka ugwu si erichasi daa,
na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya, 19dịka mmiri si akwọchasị nkume,
na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala,
otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi. 20Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;
ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya. 21Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;
ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.