Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.

Job 14:20 in English

Job 14:20 · Berean Standard Bible

You forever overpower him, and he passes on; You change his countenance and send him away.

Context

18“Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya, 19dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi. 20Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya. 21Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a; ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya. 22Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.