Job 10:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.
Job 10:17 in English
Job 10:17 · Berean Standard Bible
You produce new witnesses against me and multiply Your anger toward me. Hardships assault me in wave after wave.
Context
15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!
A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu
nʼihi na ejupụtara m nʼihere,
bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m. 16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ
ma werekwa ike gị dị egwu megide m. 17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,
mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;
ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri. 18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?
Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m. 19A sịkwarị na amụpụtaghị m
maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.