Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.

Job 10:18 in English

Job 10:18 · Berean Standard Bible

Why then did You bring me from the womb? Oh, that I had died, and no eye had seen me!

Context

16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m. 17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri. 18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m. 19A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili! 20Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.