Job 10:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
Job 10:16 in English
Job 10:16 · Berean Standard Bible
Should I hold my head high, You would hunt me like a lion, and again display Your power against me.
Context
14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,
ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m. 15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!
A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu
nʼihi na ejupụtara m nʼihere,
bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m. 16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ
ma werekwa ike gị dị egwu megide m. 17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,
mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;
ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri. 18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?
Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.