Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.

Job 10:16 in English

Job 10:16 · Berean Standard Bible

Should I hold my head high, You would hunt me like a lion, and again display Your power against me.

Context

14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m. 15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m. 16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m. 17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri. 18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.