Job 10:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
Job 10:14 in English
Job 10:14 · Berean Standard Bible
If I sinned, You would take note, and would not acquit me of my iniquity.
Context
12I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,
nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m. 13“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,
amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche. 14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,
ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m. 15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!
A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu
nʼihi na ejupụtara m nʼihere,
bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m. 16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ
ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.