Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,

Job 1:20 in English

Job 1:20 · Berean Standard Bible

Then Job stood up, tore his robe, and shaved his head. He fell to the ground and worshiped,

Context

18Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ, 19na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, 21kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.” 22Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ. 1:1 Job abụghị onye Izrel, kama ọ bụ onye Uz, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Jer 25:20 1:5 Onyeisi ezinaụlọ ọbụla na-arụ ọrụ dị ka onye nchụaja nye ezinaụlọ ya, tupu Onyenwe anyị e nye Mosis iwu banyere ihe ndị a. 1:15 Ha bụ ndị na-agagharị site nʼotu ebe gaa ebe ọzọ na-azụ ụmụ anụmanụ. Ebe obibi ha bụ na ndịda Arebịa. 1:17 Ha bụ ndị na-ebi nʼọzara Mesopotamịa, na-agagharị ịzụ ụmụ anụmanụ, ma mesie bụrụ ndị biiri nʼala Babilọn mee ka ọ ghọọ alaeze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.