Job 1:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ. 1:1 Job abụghị onye Izrel, kama ọ bụ onye Uz, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Jer 25:20 1:5 Onyeisi ezinaụlọ ọbụla na-arụ ọrụ dị ka onye nchụaja nye ezinaụlọ ya, tupu Onyenwe anyị e nye Mosis iwu banyere ihe ndị a. 1:15 Ha bụ ndị na-agagharị site nʼotu ebe gaa ebe ọzọ na-azụ ụmụ anụmanụ. Ebe obibi ha bụ na ndịda Arebịa. 1:17 Ha bụ ndị na-ebi nʼọzara Mesopotamịa, na-agagharị ịzụ ụmụ anụmanụ, ma mesie bụrụ ndị biiri nʼala Babilọn mee ka ọ ghọọ alaeze.
Job 1:22 in English
Job 1:22 · Berean Standard Bible
In all this, Job did not sin or charge God with wrongdoing.
Context
20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, 21kwuo sị:
“Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta
nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa.
Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile,
ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.” 22Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.
1:1 Job abụghị onye Izrel, kama ọ bụ onye Uz, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Jer 25:20
1:5 Onyeisi ezinaụlọ ọbụla na-arụ ọrụ dị ka onye nchụaja nye ezinaụlọ ya, tupu Onyenwe anyị e nye Mosis iwu banyere ihe ndị a.
1:15 Ha bụ ndị na-agagharị site nʼotu ebe gaa ebe ọzọ na-azụ ụmụ anụmanụ. Ebe obibi ha bụ na ndịda Arebịa.
1:17 Ha bụ ndị na-ebi nʼọzara Mesopotamịa, na-agagharị ịzụ ụmụ anụmanụ, ma mesie bụrụ ndị biiri nʼala Babilọn mee ka ọ ghọọ alaeze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.