Job 1:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ,
Job 1:18 in English
Job 1:18 · Berean Standard Bible
While he was still speaking, another messenger came and reported: “Your sons and daughters were eating and drinking wine in their oldest brother’s house,
Context
16Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 17Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa* kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 18Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ, 19na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.