Native Bible

John 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.

John 8:3 in English

John 8:3 · Berean Standard Bible

The scribes and Pharisees, however, brought to Him a woman caught in adultery. They made her stand before them

Context

1Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv. 2Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe. 3Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. 4Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. 5Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.