Native Bible

John 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.

John 8:4 in English

John 8:4 · Berean Standard Bible

and said, “Teacher, this woman was caught in the act of adultery.

Context

2Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe. 3Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. 4Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. 5Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” 6Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.