Jọn 10:27
John 10:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
John 10:27 in English
John 10:27 · Berean Standard Bible
My sheep listen to My voice; I know them, and they follow Me.
Context
25Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m. 26Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m. 27Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. 28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. 29Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.