Native Bible

Jeremiah 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I bi nʼetiti aghụghọ.* Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 9:6 in English

Jeremiah 9:6 · Berean Standard Bible

You dwell * in the midst of deception; in their deceit they refuse to know Me,” declares the LORD.

Context

4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ. 5Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie. 6I bi nʼetiti aghụghọ.* Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m? 8Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.