Jeremaya 9:7
Jeremiah 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?
Jeremiah 9:7 in English
Jeremiah 9:7 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD of Hosts says: “Behold, I will refine them and test them, for what else can I do because of * the daughter of My people?
Context
5Enyi na-aghọgbu enyi ya,
ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu.
Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha;
ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie. 6I bi nʼetiti aghụghọ.*
Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa.
Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime
nʼihi mmehie ndị m? 8Ire ha na-egbu dịka àkụ.
Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta.
Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo,
ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.” 9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị,
“M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.