Jeremaya 9:5
Jeremiah 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.
Jeremiah 9:5 in English
Jeremiah 9:5 · Berean Standard Bible
Each one betrays his friend; no one tells the truth. They have taught their tongues to lie; they wear themselves out committing iniquity.
Context
3“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,
ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ;
Ọ bụghị site nʼeziokwu
ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ.
Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ;
ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.
Atụkwasịkwala nwanne gị obi.
Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ.
Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ. 5Enyi na-aghọgbu enyi ya,
ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu.
Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha;
ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie. 6I bi nʼetiti aghụghọ.*
Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa.
Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime
nʼihi mmehie ndị m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.