Jeremaya 9:4
Jeremiah 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.
Jeremiah 9:4 in English
Jeremiah 9:4 · Berean Standard Bible
“Let everyone guard against his neighbor; do not trust any brother, for every brother deals craftily, and every friend spreads slander.
Context
2Ọ gaara adị m mma
ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara.
Ka m nwee ike hapụ ndị m
site nʼebe ha nọ pụọ.
Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko,
igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. 3“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,
ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ;
Ọ bụghị site nʼeziokwu
ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ.
Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ;
ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.
Atụkwasịkwala nwanne gị obi.
Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ.
Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ. 5Enyi na-aghọgbu enyi ya,
ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu.
Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha;
ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie. 6I bi nʼetiti aghụghọ.*
Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.