Jeremaya 9:2
Jeremiah 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara. Ka m nwee ike hapụ ndị m site nʼebe ha nọ pụọ. Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Jeremiah 9:2 in English
Jeremiah 9:2 · Berean Standard Bible
If only I had a traveler’s lodge in the wilderness, I would abandon my people and depart from them, for they are all adulterers, a crowd of faithless people.
Context
1Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta;
ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya.
Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị
nʼihi ndị m niile e gburu egbu. 2Ọ gaara adị m mma
ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara.
Ka m nwee ike hapụ ndị m
site nʼebe ha nọ pụọ.
Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko,
igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. 3“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,
ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ;
Ọ bụghị site nʼeziokwu
ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ.
Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ;
ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.
Atụkwasịkwala nwanne gị obi.
Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ.
Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.