Native Bible

Jeremiah 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.

Jeremiah 9:10 in English

Jeremiah 9:10 · Berean Standard Bible

I will take up a weeping and wailing for the mountains, a dirge over the wilderness pasture, for they have been scorched so no one passes through, and the lowing of cattle is not heard. Both the birds of the air and the beasts have fled; they have gone away.

Context

8Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.” 9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?” 10Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala. 11“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.” 12Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.