Jeremaya 9:11
Jeremiah 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”
Jeremiah 9:11 in English
Jeremiah 9:11 · Berean Standard Bible
“And I will make Jerusalem a heap of rubble, a haunt for jackals;* and I will make the cities of Judah a desolation, without inhabitant.”
Context
9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị,
“M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a?” 10Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa.
Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara.
Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya.
A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ.
Ụmụ nnụnụ efefusịala.
Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala. 11“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi.
Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri.
Aga m ekposa obodo niile nke Juda.
Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.” 12Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe? 13Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.