Native Bible

Jeremiah 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị.

Jeremiah 8:5 in English

Jeremiah 8:5 · Berean Standard Bible

Why then have these people turned away? Why does Jerusalem always turn away? They cling to deceit; they refuse to return.

Context

3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ? 5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị. 6Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha. 7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.