Jeremaya 8:5
Jeremiah 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị.
Jeremiah 8:5 in English
Jeremiah 8:5 · Berean Standard Bible
Why then have these people turned away? Why does Jerusalem always turn away? They cling to deceit; they refuse to return.
Context
3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?
Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ? 5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?
Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?
Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;
ha jụrụ ịtụgharị. 6Aṅaala m ntị,
ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.
O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,
“Gịnị bụ ihe a m mere?”
Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,
dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha. 7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe
maara oge ya a kara aka.
Nduru, na eleke, na okwolo
makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.
Ma ndị m amaghị
ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.