Native Bible

Jeremiah 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.

Jeremiah 8:7 in English

Jeremiah 8:7 · Berean Standard Bible

Even the stork in the sky knows her appointed seasons. The turtledove, the swift, and the thrush * keep their time of migration, but My people do not know the requirements of the LORD.

Context

5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị. 6Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha. 7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha. 8“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri? 9A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.