Jeremaya 8:7
Jeremiah 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.
Jeremiah 8:7 in English
Jeremiah 8:7 · Berean Standard Bible
Even the stork in the sky knows her appointed seasons. The turtledove, the swift, and the thrush * keep their time of migration, but My people do not know the requirements of the LORD.
Context
5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?
Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?
Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;
ha jụrụ ịtụgharị. 6Aṅaala m ntị,
ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.
O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,
“Gịnị bụ ihe a m mere?”
Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,
dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha. 7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe
maara oge ya a kara aka.
Nduru, na eleke, na okwolo
makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.
Ma ndị m amaghị
ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha. 8“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ,
nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,”
ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu
adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri? 9A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe;
a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya.
Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị,
ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.