Native Bible

Jeremiah 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?

Jeremiah 8:9 in English

Jeremiah 8:9 · Berean Standard Bible

The wise will be put to shame; they will be dismayed and trapped. Since they have rejected the word of the LORD, what wisdom do they really have?

Context

7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha. 8“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri? 9A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere? 10Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 11Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.