Jeremaya 8:9
Jeremiah 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
Jeremiah 8:9 in English
Jeremiah 8:9 · Berean Standard Bible
The wise will be put to shame; they will be dismayed and trapped. Since they have rejected the word of the LORD, what wisdom do they really have?
Context
7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe
maara oge ya a kara aka.
Nduru, na eleke, na okwolo
makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.
Ma ndị m amaghị
ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha. 8“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ,
nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,”
ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu
adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri? 9A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe;
a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya.
Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị,
ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere? 10Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha,
werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ.
Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 11Ha na-ekechi ọnya ndị m
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,”
mgbe udo na-adịghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.