Native Bible

Jeremiah 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?

Jeremiah 8:4 in English

Jeremiah 8:4 · Berean Standard Bible

So you are to tell them this is what the LORD says: “Do men fall and not get up again? Does one turn away and not return?

Context

2A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ? 5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị. 6Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.