Jeremaya 8:4
Jeremiah 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
Jeremiah 8:4 in English
Jeremiah 8:4 · Berean Standard Bible
So you are to tell them this is what the LORD says: “Do men fall and not get up again? Does one turn away and not return?
Context
2A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?
Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ? 5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?
Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?
Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;
ha jụrụ ịtụgharị. 6Aṅaala m ntị,
ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.
O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,
“Gịnị bụ ihe a m mere?”
Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,
dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.