Jeremaya 8:2
Jeremiah 8:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi.
Jeremiah 8:2 in English
Jeremiah 8:2 · Berean Standard Bible
They will be exposed to the sun and moon, and to all the host of heaven which they have loved, served, followed, consulted, and worshiped. Their bones will not be gathered up or buried, but will become like dung lying on the ground.
Context
1“ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem. 2A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?
Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.