Jeremaya 8:1
Jeremiah 8:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem.
Jeremiah 8:1 in English
Jeremiah 8:1 · Berean Standard Bible
“At that time,” declares the LORD, “the bones of the kings of Judah, the bones of the officials, the bones of the priests, the bones of the prophets, and the bones of the people of Jerusalem will be removed from their graves.
Context
1“ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem. 2A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.